1 Kings 11

Ọtụtụ ndị inyom Solomọn

1Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het. 2Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya. 3Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya. 4Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere. 5Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek,
Maọbụ, Milkọm
bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
6Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.

7Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem,
Ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem Ugwu a, bụ Ugwu Oliv, nke aha ọzọ a na-akpọ ya bụ Ugwu rụrụ arụ, 2Ez 23:13
Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
8O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha.

9 Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe Onyenwe anyị Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ. 10Ọ bụ ezie na o nyere Solomọn iwu ka ọ ghara ịgbaso chi ndị ọzọ, ma Solomọn erubeghị isi nʼiwu a Onyenwe anyị nyere. 11Ya mere, Onyenwe anyị gwara Solomọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, jụ idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m, nke m nyere gị idebe, aghaghị m isite nʼaka gị dọkapụ alaeze a, were ya nye otu nʼime ndị na-ejere gị ozi. 12Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel. 13Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.”

Ndị iro Solomọn

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm. 15Nʼoge gara aga, mgbe Devid na-ebuso ndị Edọm agha, Joab, onyeisi ndị agha, onye gara ili ndị agha e gburu egbu, tigburu ndị ikom niile nọ nʼEdọm. 16Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm. 17Ma Hadad, onye bụ nwantakịrị nʼoge ahụ, gbapụrụ ọsọ gbaga Ijipt, ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị Edọm, ndị jeere nna ya ozi. 18Ha sitere nʼala Midia gaa Paran. Site na Paran, ha duuru ụfọdụ ndị mmadụ, ndị sooro ha gaa Ijipt, jekwuru Fero eze Ijipt, onye nyere Hadad ụlọ obibi na ala, nyekwa ya ihe oriri.

19Hadad hụtara amara nʼihu Fero, nke mere na ọ kpọnyere ya nwanne nwanyị Tapenes bụ nwunye eze ka ọ bụrụ nwunye ya. 20Nwanne Tapenes mụtara ya nwa nwoke aha ya bụ Genubat, onye Tapenes zụlitere nʼụlọeze. Genubat biri nʼetiti ụmụ Fero.

21Mgbe Hadad nọ nʼIjipt, ọ nụrụ na Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ na Joab ọchịagha ndị agha anwụọkwala, ọ rịọrọ Fero arịrịọ ka o kwenye ka ọ laghachi nʼEdọm.

22Fero jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji chọọ ịla? O nwere ihe ị chọrọ nke ị na-adịghị enweta nʼebe a?”

Hadad zara sị ya, “O nweghị ihe kọrọ m, kama kwere ka m laghachi.”

23Nwoke ọzọ Chineke mere ka ọ bụrụ onye iro Solomọn bụ Rezon nwa Eliada, onye gbapụrụ site nʼaka nna ya ukwu bụ Hadadeza, eze Zoba. 24Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ. 25Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.

Nnupu isi Jeroboam

26Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ.

27Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya. 28Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.

29Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ. 30Mgbe ahụ, Ahija yipụrụ uwe ọhụrụ nke o yi nʼahụ dọwasịa ya ụzọ iri na abụọ. 31Mgbe ahụ, ọ gwara Jeroboam sị, “Chịrị iberibe iri nye onwe gị, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Lee, aga m anapụ Solomọn alaeze a, ma aga m enyekwa gị ebo iri nʼime ha. 32Ma aga m ahapụrụ ya otu ebo, nʼihi ohu m Devid na nʼihi Jerusalem obodo m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel. 33Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere.

34“ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile. 35Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri. 36Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị. 37Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel. 38Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel. 39Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ”

40Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt.
Eze Shishak, bụ Fero mbụ chịrị Ijipt na senchuri nke iri. Mgbe ọchịchị pụrụ site nʼaka ezinaụlọ a, ahọpụtara onye ọzọ ga-achị 1Ez 14:25-26; 2Ih 12:2-9
Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ.

Ọnwụ Solomọn

41Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn? 42Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem. 43O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya.

Copyright information for IboBIU